Native Bible

Isaiah 42:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ; tookwanụ ya, unu ndị niile bi na nsọtụ niile nke ụwa, unu ndị na-arịda nʼosimiri, na ihe niile bi nʼime ya. Toonu ya unu ndị bi nʼala ebe mmiri gbara gburugburu.

Isaiah 42:10 in English

Isaiah 42:10 · Berean Standard Bible

Sing to the LORD a new song— His praise from the ends of the earth— you who go down to the sea, and all that is in it, you islands,* and all who dwell in them.

Context

8“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị! Nke a bụkwa aha m. Agaghị m enye onye ọzọ ugwu na nsọpụrụ m. Mụ na arụsị a pịrị apị agakwaghị azọ otuto m. 9Lee ihe ochie emezuola ma nke ọhụrụ ka m na-ekwupụta. Tupu ha pụta ìhè ana m akpọsa ha nye unu.” 10Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ; tookwanụ ya, unu ndị niile bi na nsọtụ niile nke ụwa, unu ndị na-arịda nʼosimiri, na ihe niile bi nʼime ya. Toonu ya unu ndị bi nʼala ebe mmiri gbara gburugburu. 11Ka ọzara na obodo niile dị nʼime ya welie olu ha elu, ka ndị bi na Keda ṅụrịa ọṅụ. Ka ndị bi na Sela tie mkpu ọṅụ, ka ha si nʼelu ugwu niile tisie mkpu ọṅụ ike. 12Ka ha nye Onyenwe anyị ebube, kpọsaakwa otuto ya nʼala niile mmiri gbara gburugburu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.