Aịzaya 42:11
Isaiah 42:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka ọzara na obodo niile dị nʼime ya welie olu ha elu, ka ndị bi na Keda ṅụrịa ọṅụ. Ka ndị bi na Sela tie mkpu ọṅụ, ka ha si nʼelu ugwu niile tisie mkpu ọṅụ ike.
Isaiah 42:11 in English
Isaiah 42:11 · Berean Standard Bible
Let the desert and its cities raise their voices; let the villages of Kedar cry aloud. Let the people of Sela sing for joy; let them cry out from the mountaintops.
Context
9Lee ihe ochie emezuola
ma nke ọhụrụ ka m na-ekwupụta.
Tupu ha pụta ìhè
ana m akpọsa ha nye unu.” 10Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ; tookwanụ ya,
unu ndị niile bi na nsọtụ niile nke ụwa,
unu ndị na-arịda nʼosimiri, na ihe niile bi nʼime ya.
Toonu ya unu ndị bi nʼala ebe mmiri gbara gburugburu. 11Ka ọzara na obodo niile dị nʼime ya welie olu ha elu,
ka ndị bi na Keda ṅụrịa ọṅụ.
Ka ndị bi na Sela tie mkpu ọṅụ,
ka ha si nʼelu ugwu niile tisie mkpu ọṅụ ike. 12Ka ha nye Onyenwe anyị ebube,
kpọsaakwa otuto ya nʼala niile mmiri gbara gburugburu. 13Onyenwe anyị ga-apụta buo agha dịka dike.
Ọ bụ site nʼịnụ ọkụ nʼobi nke onye agha ka ọ ga-eji buo agha.
Ọ ga-eti mkpu agha megide ndị iro ya,
ma merie ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.