Native Bible

Isaiah 39:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, Aịzaya onye amụma jekwuru eze Hezekaya jụọ ya sị, “Gịnị ka ndị ikom ndị ahụ kwuru? Ebeekwa ka ha si bịakwute gị?” Hezekaya zara sị, “Ọ bụ nʼala dị anya ka ha si bịakwute m, ha si Babilọn.”

Isaiah 39:3 in English

Isaiah 39:3 · Berean Standard Bible

Then the prophet Isaiah went to King Hezekiah and asked, “Where did those men come from, and what did they say to you?” “They came to me from a distant land,” Hezekiah replied, “from Babylon.”

Context

1Nʼoge ahụ, Merodak-Baladan, nwa Baladan, bụ eze Babilọn zigaara Hezekaya akwụkwọ ozi ekele na onyinye, nʼihi na ọ nụrụ na Hezekaya rịara ọrịa ma nwe ahụ ike. 2Hezekaya nabatara ndị ozi ahụ nke ọma gosi ha ihe ndị dị nʼụlọakụ ya, ọlaọcha, na ọlaedo, ụda dị iche iche na-esi isi ụtọ, ezigbo mmanụ oliv, ụlọ niile ebe ngwa agha ya niile dị, na ihe niile bụ akụ o nwere. Ọ dịghị ihe dị nʼụlọeze ya maọbụ nʼalaeze ya niile nke ọ na-egosighị ha. 3Mgbe ahụ, Aịzaya onye amụma jekwuru eze Hezekaya jụọ ya sị, “Gịnị ka ndị ikom ndị ahụ kwuru? Ebeekwa ka ha si bịakwute gị?” Hezekaya zara sị, “Ọ bụ nʼala dị anya ka ha si bịakwute m, ha si Babilọn.” 4Onye amụma jụrụ, “Gịnị ka ha hụrụ nʼụlọ gị?” Hezekaya zara sị, “Ihe niile nke dị nʼụlọ m ka ha hụrụ. Ọ dịghị ihe niile dị nʼụlọakụ m nke m na-egosighị ha.” 5Mgbe ahụ, Aịzaya sịrị Hezekaya, “Gee ntị nụrụ okwu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.