Native Bible

Isaiah 39:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼoge ahụ, Merodak-Baladan, nwa Baladan, bụ eze Babilọn zigaara Hezekaya akwụkwọ ozi ekele na onyinye, nʼihi na ọ nụrụ na Hezekaya rịara ọrịa ma nwe ahụ ike.

Isaiah 39:1 in English

Isaiah 39:1 · Berean Standard Bible

At that time Merodach-baladan son of Baladan king of Babylon sent letters and a gift to Hezekiah, for he had heard about Hezekiah’s illness and recovery.

Context

1Nʼoge ahụ, Merodak-Baladan, nwa Baladan, bụ eze Babilọn zigaara Hezekaya akwụkwọ ozi ekele na onyinye, nʼihi na ọ nụrụ na Hezekaya rịara ọrịa ma nwe ahụ ike. 2Hezekaya nabatara ndị ozi ahụ nke ọma gosi ha ihe ndị dị nʼụlọakụ ya, ọlaọcha, na ọlaedo, ụda dị iche iche na-esi isi ụtọ, ezigbo mmanụ oliv, ụlọ niile ebe ngwa agha ya niile dị, na ihe niile bụ akụ o nwere. Ọ dịghị ihe dị nʼụlọeze ya maọbụ nʼalaeze ya niile nke ọ na-egosighị ha. 3Mgbe ahụ, Aịzaya onye amụma jekwuru eze Hezekaya jụọ ya sị, “Gịnị ka ndị ikom ndị ahụ kwuru? Ebeekwa ka ha si bịakwute gị?” Hezekaya zara sị, “Ọ bụ nʼala dị anya ka ha si bịakwute m, ha si Babilọn.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.