Native Bible

Isaiah 37:36 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mmụọ ozi Onyenwe anyị pụrụ gaa tigbuo otu puku narị na puku iri asatọ na ise nʼụlọ ikwu ndị Asịrịa. Mgbe ndị mmadụ tetara nʼisi ụtụtụ, lee, ozu ka ha jupụtara ebe niile.

Isaiah 37:36 in English

Isaiah 37:36 · Berean Standard Bible

Then the angel of the LORD went out and struck down 185,000 men in the camp of the Assyrians. When the people got up * the next morning, there were all the dead bodies!

Context

34Ụzọ o si bịa ka ọ ga-esi laghachi; ọ gaghị abanye nʼobodo a.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 35“Aga m echebe obodo a, zọpụtakwa ya nʼihi aha m, na nʼihi Devid, bụ ohu m.” 36Mmụọ ozi Onyenwe anyị pụrụ gaa tigbuo otu puku narị na puku iri asatọ na ise nʼụlọ ikwu ndị Asịrịa. Mgbe ndị mmadụ tetara nʼisi ụtụtụ, lee, ozu ka ha jupụtara ebe niile. 37Ya mere, Senakerib, eze Asịrịa, biliri ije, laghachi nʼala ya. Ọ laghachiri biri nʼobodo Ninive. 38Otu ụbọchị, mgbe ọ nọ na-akpọ isiala nʼụlọ chi ya a na-akpọ Nisrọk, ụmụ ya ndị ikom aha ha bụ Adramelek na Shareza were mma agha gbuo ya. Ha gbapụrụ ọsọ gbaga nʼala Ararat. Isahadon, bụ nwa ya nwoke ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. 37:29 Ọ bụrụ na ndị agha Asịrịa e merie obodo nʼagha, ha na-eji nko tinye nʼimi ndị ha dọtara nʼagha, jirikwa eriri igwe tinye nʼọnụ ha. 37:30 Ya bụ, akara 37:32 Gbapụrụ a gbapụ maka ụjọ

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.