Aịzaya 37:35
Isaiah 37:35 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Aga m echebe obodo a, zọpụtakwa ya nʼihi aha m, na nʼihi Devid, bụ ohu m.”
Isaiah 37:35 in English
Isaiah 37:35 · Berean Standard Bible
‘I will defend this city and save it for My own sake and for the sake of My servant David.’”
Context
33“Ya mere, nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru banyere eze Asịrịa.
“Ọ gaghị azọbata ụkwụ ya nʼime obodo a
maọbụ gbaa ọ bụladị otu àkụ nʼebe a.
Ọ gaghị eji ọta jegharịa nʼọnụ ụzọ ama ya,
maọbụ wuo mgbidi nnọchibido megide ya. 34Ụzọ o si bịa ka ọ ga-esi laghachi;
ọ gaghị abanye nʼobodo a.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 35“Aga m echebe obodo a, zọpụtakwa ya nʼihi aha m,
na nʼihi Devid, bụ ohu m.” 36Mmụọ ozi Onyenwe anyị pụrụ gaa tigbuo otu puku narị na puku iri asatọ na ise nʼụlọ ikwu ndị Asịrịa. Mgbe ndị mmadụ tetara nʼisi ụtụtụ, lee, ozu ka ha jupụtara ebe niile. 37Ya mere, Senakerib, eze Asịrịa, biliri ije, laghachi nʼala ya. Ọ laghachiri biri nʼobodo Ninive.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.