Aịzaya 32:5
Isaiah 32:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼụbọchị ahụ, a gaghị ahụkwa onye nzuzu sị na ọ bụ onye maara ihe. A gaghị enyekwa onye aghụghọ nsọpụrụ ọzọ.
Isaiah 32:5 in English
Isaiah 32:5 · Berean Standard Bible
No longer will a fool be called noble, nor a scoundrel be respected.
Context
3Mgbe ahụ, agaghị emechikwa anya ndị niile na-ahụ ụzọ,
agakwaghị eme ka ntị na-anụ ihe kwụsị ịnụ ihe. 4Ọ bụladị obi ndị nzuzu nʼetiti ha ga-ejupụta nʼakọnuche na nghọta,
ndị ahụ na-asụ nsụ ga-ekwukwa okwu nke ọma. 5Nʼụbọchị ahụ, a gaghị ahụkwa onye nzuzu sị na ọ bụ onye maara ihe.
A gaghị enyekwa onye aghụghọ nsọpụrụ ọzọ. 6Nʼihi na ndị nzuzu na-ekwu okwu na-echeghị echiche,
obi ha niile dị na-ime ajọ ihe.
Ọ na-ebi ndụ asọpụrụghị Chineke,
na-ekwusakwa okwu njehie megide Onyenwe anyị;
ndị agụụ na-agụ ka ha na-agbaba aka
ndị akpịrị na-akpọ nkụ, ha adịghị enye ha mmiri ọṅụṅụ. 7Ndị ọjọọ na-eji ụzọ aghụghọ niile eme ihe ọjọọ,
ha na-echepụta nzube ajọ ihe niile,
iji okwu ụgha laa onye ogbenye nʼiyi,
ọ bụladị mgbe arịrịọ nke onye ahụ nọ na mkpa bụ nke ziri ezi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.