Aịzaya 32:19
Isaiah 32:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A sikwa na mkpụrụ mmiri ezoo nʼoke ọhịa niile, a sikwa na e bibie obodo niile,
Isaiah 32:19 in English
Isaiah 32:19 · Berean Standard Bible
But hail will level the forest, and the city will sink to the depths.
Context
17Mkpụrụ nke ezi omume ahụ ga-abụ udo;
ihe ga-esikwa na ya pụta ga-abụ ị nọ jụụ na ntụkwasị obi mgbe niile ebighị ebi. 18Ndị m ga-ebi nʼebe obibi nke udo,
nʼụlọ nwere ezi nchekwa,
nʼebe izuike nke nsogbu na-adịghị. 19A sikwa na mkpụrụ mmiri ezoo nʼoke ọhịa niile,
a sikwa na e bibie obodo niile, 20ndị a gọziri agọzi ka unu ga-abụ,
mgbe unu na-agha mkpụrụ unu nʼakụkụ iyi,
mgbe ehi unu na ịnyịnya ibu unu na-akpagharị na-aga ebe ọbụla ha chọrọ.
32:16 Ga-erute onye ọbụla aka
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.