Aịzaya 30:28
Isaiah 30:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Iku ume ya dịkwa ka iyi rubigara oke, nke na-achị ọkụ, nke na-etoru onye nọ nʼime ya nʼolu. Ọ na-ayọcha mba niile nʼime nyọ ịla nʼiyi, ọ na-etinye nʼagba ndị mmadụ eriri igwe nke na-edufu ha.
Isaiah 30:28 in English
Isaiah 30:28 · Berean Standard Bible
His breath is like a rushing torrent that rises to the neck. He comes to sift the nations in a sieve of destruction; He bridles the jaws of the peoples to lead them astray.
Context
26Ọnwa ga-amụke dịka anwụ, ìhè anyanwụ ga-adịkwa okpukpu asaa dịka ìhè ụbọchị asaa e mere ka ọ mụọ nʼotu ụbọchị! Ihe ndị a ga-emezu nʼụbọchị ahụ Onyenwe anyị malitere ikechi na ịgwọ ọnya o mere ka o rute ndị ya aka. 27Lee, Aha Onyenwe anyị ka o si nʼebe dị anya na-abịa!
Ọ na-abịa nʼoke iwe, anwụrụ ọkụ gbakwara ya gburugburu.
Iwe jupụtara nʼegbugbere ọnụ ya,
okwu ya na-erechapụ dịka ọkụ. 28Iku ume ya dịkwa ka iyi rubigara oke, nke na-achị ọkụ,
nke na-etoru onye nọ nʼime ya nʼolu.
Ọ na-ayọcha mba niile nʼime nyọ ịla nʼiyi,
ọ na-etinye nʼagba ndị mmadụ
eriri igwe nke na-edufu ha. 29Ma unu ga-abụ abụ
dịka unu na-abụ nʼabalị mmemme dị nsọ,
obi unu ga-aṅụrị ọṅụ
dịka mgbe ndị na-egbu opi na-arịgo elu
na-aga nʼugwu nsọ Onyenwe anyị,
na-agakwuru Oke Nkume Izrel. 30Onyenwe anyị ga-eme ka ndị mmadụ nụ olu ya dị ebube,
ọ ga-emekwa ka ha hụ aka ya na-arịdata ala
jiri ọnụma nke iwe ya na ọkụ na-erepịa erepịa,
jirikwa oke mmiri ozuzo, na egbe eluigwe, na akụmmiri igwe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.