Aịzaya 30:26
Isaiah 30:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọnwa ga-amụke dịka anwụ, ìhè anyanwụ ga-adịkwa okpukpu asaa dịka ìhè ụbọchị asaa e mere ka ọ mụọ nʼotu ụbọchị! Ihe ndị a ga-emezu nʼụbọchị ahụ Onyenwe anyị malitere ikechi na ịgwọ ọnya o mere ka o rute ndị ya aka.
Isaiah 30:26 in English
Isaiah 30:26 · Berean Standard Bible
The light of the moon will be as bright as the sun, and the light of the sun will be seven times brighter—like the light of seven days—on the day that the LORD binds up the brokenness of His people and heals the wounds He has inflicted.
Context
24Ehi na ịnyịnya ibu ndị na-arụ ọrụ ubi ga-ata nri a gwara nke ọma nke nnu dị, nke eji ngwa ọrụ ịfụcha ọka na shọvel kpasaa nke ọma. 25Nʼelu ugwu ọbụla dị elu na nʼelu ugwu nta ọbụla dị elu, ka iyi na mmiri niile ga-eru, nʼụbọchị oke ogbugbu, mgbe ụlọ elu niile ga-ada. 26Ọnwa ga-amụke dịka anwụ, ìhè anyanwụ ga-adịkwa okpukpu asaa dịka ìhè ụbọchị asaa e mere ka ọ mụọ nʼotu ụbọchị! Ihe ndị a ga-emezu nʼụbọchị ahụ Onyenwe anyị malitere ikechi na ịgwọ ọnya o mere ka o rute ndị ya aka. 27Lee, Aha Onyenwe anyị ka o si nʼebe dị anya na-abịa!
Ọ na-abịa nʼoke iwe, anwụrụ ọkụ gbakwara ya gburugburu.
Iwe jupụtara nʼegbugbere ọnụ ya,
okwu ya na-erechapụ dịka ọkụ. 28Iku ume ya dịkwa ka iyi rubigara oke, nke na-achị ọkụ,
nke na-etoru onye nọ nʼime ya nʼolu.
Ọ na-ayọcha mba niile nʼime nyọ ịla nʼiyi,
ọ na-etinye nʼagba ndị mmadụ
eriri igwe nke na-edufu ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.