Native Bible

Isaiah 30:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma unu ga-abụ abụ dịka unu na-abụ nʼabalị mmemme dị nsọ, obi unu ga-aṅụrị ọṅụ dịka mgbe ndị na-egbu opi na-arịgo elu na-aga nʼugwu nsọ Onyenwe anyị, na-agakwuru Oke Nkume Izrel.

Isaiah 30:29 in English

Isaiah 30:29 · Berean Standard Bible

You will sing as on the night of a holy festival, and your heart will rejoice like one who walks to the music of a flute, going up to the mountain of the LORD, to the Rock of Israel.

Context

27Lee, Aha Onyenwe anyị ka o si nʼebe dị anya na-abịa! Ọ na-abịa nʼoke iwe, anwụrụ ọkụ gbakwara ya gburugburu. Iwe jupụtara nʼegbugbere ọnụ ya, okwu ya na-erechapụ dịka ọkụ. 28Iku ume ya dịkwa ka iyi rubigara oke, nke na-achị ọkụ, nke na-etoru onye nọ nʼime ya nʼolu. Ọ na-ayọcha mba niile nʼime nyọ ịla nʼiyi, ọ na-etinye nʼagba ndị mmadụ eriri igwe nke na-edufu ha. 29Ma unu ga-abụ abụ dịka unu na-abụ nʼabalị mmemme dị nsọ, obi unu ga-aṅụrị ọṅụ dịka mgbe ndị na-egbu opi na-arịgo elu na-aga nʼugwu nsọ Onyenwe anyị, na-agakwuru Oke Nkume Izrel. 30Onyenwe anyị ga-eme ka ndị mmadụ nụ olu ya dị ebube, ọ ga-emekwa ka ha hụ aka ya na-arịdata ala jiri ọnụma nke iwe ya na ọkụ na-erepịa erepịa, jirikwa oke mmiri ozuzo, na egbe eluigwe, na akụmmiri igwe. 31Olu Onyenwe anyị ga-emenye ndị Asịrịa egwu; ọ ga-eji mkpara igwe ya kụdaa ha nʼala.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.