Aịzaya 30:29
Isaiah 30:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma unu ga-abụ abụ dịka unu na-abụ nʼabalị mmemme dị nsọ, obi unu ga-aṅụrị ọṅụ dịka mgbe ndị na-egbu opi na-arịgo elu na-aga nʼugwu nsọ Onyenwe anyị, na-agakwuru Oke Nkume Izrel.
Isaiah 30:29 in English
Isaiah 30:29 · Berean Standard Bible
You will sing as on the night of a holy festival, and your heart will rejoice like one who walks to the music of a flute, going up to the mountain of the LORD, to the Rock of Israel.
Context
27Lee, Aha Onyenwe anyị ka o si nʼebe dị anya na-abịa!
Ọ na-abịa nʼoke iwe, anwụrụ ọkụ gbakwara ya gburugburu.
Iwe jupụtara nʼegbugbere ọnụ ya,
okwu ya na-erechapụ dịka ọkụ. 28Iku ume ya dịkwa ka iyi rubigara oke, nke na-achị ọkụ,
nke na-etoru onye nọ nʼime ya nʼolu.
Ọ na-ayọcha mba niile nʼime nyọ ịla nʼiyi,
ọ na-etinye nʼagba ndị mmadụ
eriri igwe nke na-edufu ha. 29Ma unu ga-abụ abụ
dịka unu na-abụ nʼabalị mmemme dị nsọ,
obi unu ga-aṅụrị ọṅụ
dịka mgbe ndị na-egbu opi na-arịgo elu
na-aga nʼugwu nsọ Onyenwe anyị,
na-agakwuru Oke Nkume Izrel. 30Onyenwe anyị ga-eme ka ndị mmadụ nụ olu ya dị ebube,
ọ ga-emekwa ka ha hụ aka ya na-arịdata ala
jiri ọnụma nke iwe ya na ọkụ na-erepịa erepịa,
jirikwa oke mmiri ozuzo, na egbe eluigwe, na akụmmiri igwe. 31Olu Onyenwe anyị ga-emenye ndị Asịrịa egwu;
ọ ga-eji mkpara igwe ya kụdaa ha nʼala.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.