Aịzaya 28:8
Isaiah 28:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na tebul ha niile jupụtara nʼihe ọgbụgbọ ruru unyi. O nwekwaghị ebe dị ọcha.
Isaiah 28:8 in English
Isaiah 28:8 · Berean Standard Bible
For all their tables are covered with vomit; there is not a place without filth.
Context
6Ọ ga-abụ mmụọ nke ikpe ziri ezi
nye ndị ikpe.
Ọ ga-abụkwa ike
nye ndị na-achụghachi ndị iro azụ nʼọnụ ụzọ ama. 7Ndị a kwa na-adagharị site na mmanya
sitekwa nʼihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya.
Ndị nchụaja na ndị amụma na-adagharị site na ihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya,
mmanya emeela na ha amakwaghị ihe ha na-eme;
ha na-adagharị site nʼihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya
ha na-adagharị mgbe ha na-ahụ ọhụ dị iche iche,
ha na-asọ ngọngọ mgbe ha nʼekpe ikpe. 8Nʼihi na tebul ha niile jupụtara nʼihe ọgbụgbọ ruru unyi.
O nwekwaghị ebe dị ọcha. 9“Ọ bụ onye ka ọ na-achọ ikuziri ihe?
Ọ bụ onye ka ọ na-achọ ka ọ ghọta ozi ya?
Ọ bụ ụmụnta ndị a kwusịrị ịṅụ mmiri ara,
bụ ndị a ka napụrụ ara? 10Nʼihi na ọ na-agbalị izi anyị ihe dịka e si dee ya,
ahịrị ime nke a, nʼahịrị ime nke ọzọ,
nʼusoro tụkwasị nʼusoro,
nwantịntị nʼebe a, nwantịntị nʼebe ahụ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.