Aịzaya 28:6
Isaiah 28:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ ga-abụ mmụọ nke ikpe ziri ezi nye ndị ikpe. Ọ ga-abụkwa ike nye ndị na-achụghachi ndị iro azụ nʼọnụ ụzọ ama.
Isaiah 28:6 in English
Isaiah 28:6 · Berean Standard Bible
a spirit of justice to him who sits in judgment, and a strength to those who repel the onslaught at the gate.
Context
4Okoko ọhịa nke na-akpọnwụ akpọnwụ, nke bụ ebube ịma mma ya,
nke dị nʼisi ndagwurugwu na-emepụta ihe,
ga-adị ka mkpụrụ fiig chara tupu oge owuwe ihe ubi eruo,
nke mgbe onye ọbụla hụrụ ha na-ewere ha nʼaka,
tinye nʼọnụ ya, loo ha. 5Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nʼonwe ya,
ga-aghọrọ ndị ya fọdụrụ nʼala ahụ
okpueze mara mma,
ọ ga-aghọkwara ha okoko mara mma. 6Ọ ga-abụ mmụọ nke ikpe ziri ezi
nye ndị ikpe.
Ọ ga-abụkwa ike
nye ndị na-achụghachi ndị iro azụ nʼọnụ ụzọ ama. 7Ndị a kwa na-adagharị site na mmanya
sitekwa nʼihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya.
Ndị nchụaja na ndị amụma na-adagharị site na ihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya,
mmanya emeela na ha amakwaghị ihe ha na-eme;
ha na-adagharị site nʼihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya
ha na-adagharị mgbe ha na-ahụ ọhụ dị iche iche,
ha na-asọ ngọngọ mgbe ha nʼekpe ikpe. 8Nʼihi na tebul ha niile jupụtara nʼihe ọgbụgbọ ruru unyi.
O nwekwaghị ebe dị ọcha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.