Aịzaya 28:27
Isaiah 28:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na ejighị igwe eji azọcha mkpụrụ ọka etichapụta mkpụrụ karawe, maọbụ kpọree ụkwụ igwe* nʼelu kumin, kama ọ bụ mkpọrọ ka e ji etichapụta kumin, werekwa osisi nta kwesiri ekwesi kupụta karawe.
Isaiah 28:27 in English
Isaiah 28:27 · Berean Standard Bible
Surely caraway is not threshed with a sledge, and the wheel of a cart is not rolled over the cumin. But caraway is beaten out with a stick, and cumin with a rod.
Context
25Mgbe o gwuzesịrị ya,
ọ naghị aghasa mkpụrụ karawe, ghasaakwa kumin?
Ọ bụ na ọ naghị akụnye ọka wiiti nʼahịrị nke ya,
ọka balị nʼebe o kwesiri,
na spelti nʼebe o kwesiri? 26Ọ maara ihe o kwesiri ime,
nʼihi na Chineke na-ezi ụzọ ziri ezi. 27Nʼihi na ejighị igwe eji azọcha mkpụrụ ọka etichapụta mkpụrụ karawe,
maọbụ kpọree ụkwụ igwe* nʼelu kumin,
kama ọ bụ mkpọrọ ka e ji etichapụta kumin,
werekwa osisi nta kwesiri ekwesi kupụta karawe. 28A na-akwọ ọka e ji eme achịcha akwọ,
ọ bụghị ruo mgbe ebighị ebi ka a na-anọgide na-etichapụta ya.
E nwere ike jiri ụkwụ igwe ụgbọala ịnyịnya na-adọkpụ zọchaa ha,
ma ọ bụghị ka a kwọpịasịa mkpụrụ ha. 29Ihe ndị a niile na-esite nʼaka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-abịa,
onye nzube ya dị ịtụnanya,
onye amamihe ya dị ebube.
28:1 Okpueze okoko nʼebe a, na-ekwu banyere obodo Sameria.
28:2 Nʼebe a otu onye ahụ dị ike bụ eze ndị Asịrịa.
28:16 Onye ọbụla na-ewukwasị ndụ ya nʼelu ya agaghị enwe ihe egwu ọbụla;
28:16 Agaghị eme ọsịịsọ laghachi azụ.
28:27 Lit. wịịlu
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.