Aịzaya 28:26
Isaiah 28:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ maara ihe o kwesiri ime, nʼihi na Chineke na-ezi ụzọ ziri ezi.
Isaiah 28:26 in English
Isaiah 28:26 · Berean Standard Bible
For his God instructs and teaches him properly.
Context
24Ọ bụ ụbọchị niile ka onye ọrụ ubi na-akọ ala ubi ya hapụ ịkụnye ya mkpụrụ?
Ọ bụ mgbe niile ka ọ na-egwuze ala ubi ya ime ka ọ dị larịị, ma ọ gaghị akụnye ya mkpụrụ ọbụla? 25Mgbe o gwuzesịrị ya,
ọ naghị aghasa mkpụrụ karawe, ghasaakwa kumin?
Ọ bụ na ọ naghị akụnye ọka wiiti nʼahịrị nke ya,
ọka balị nʼebe o kwesiri,
na spelti nʼebe o kwesiri? 26Ọ maara ihe o kwesiri ime,
nʼihi na Chineke na-ezi ụzọ ziri ezi. 27Nʼihi na ejighị igwe eji azọcha mkpụrụ ọka etichapụta mkpụrụ karawe,
maọbụ kpọree ụkwụ igwe* nʼelu kumin,
kama ọ bụ mkpọrọ ka e ji etichapụta kumin,
werekwa osisi nta kwesiri ekwesi kupụta karawe. 28A na-akwọ ọka e ji eme achịcha akwọ,
ọ bụghị ruo mgbe ebighị ebi ka a na-anọgide na-etichapụta ya.
E nwere ike jiri ụkwụ igwe ụgbọala ịnyịnya na-adọkpụ zọchaa ha,
ma ọ bụghị ka a kwọpịasịa mkpụrụ ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.