Aịzaya 22:11
Isaiah 22:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu gwuru ọdọ mmiri nʼetiti mgbidi abụọ maka ichekwa mmiri si nʼọdọ mmiri ochie, ma unu elekwasịghị Onye ahụ kere ya anya, unu ejikwaghị Onye ahụ tụrụ atụmatụ ya site na mgbe gara aga kpọrọ ihe.
Isaiah 22:11 in English
Isaiah 22:11 · Berean Standard Bible
You built a reservoir between the walls for the waters of the ancient pool, but you did not look to the One who made it, or consider Him who planned it long ago.
Context
9Unu hụrụ na mgbidi obodo Devid
nwere ọtụtụ mgbawa nʼebe dị iche iche na ya.
Unu chekọtara mmiri
nʼọdọ mmiri nke ala ala. 10Unu gụrụ ụlọ dị na Jerusalem ọnụ,
tiwaa ụfọdụ ụlọ iji mee ka mgbidi sie ike. 11Unu gwuru ọdọ mmiri nʼetiti mgbidi abụọ
maka ichekwa mmiri si nʼọdọ mmiri ochie,
ma unu elekwasịghị Onye ahụ kere ya anya,
unu ejikwaghị Onye ahụ tụrụ atụmatụ ya site na mgbe gara aga kpọrọ ihe. 12Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
kpọrọ unu ụbọchị ahụ
ka unu kwaa akwa, ruo ụjụ,
kpụchaa agịrị isi unu ma yirikwa akwa mkpe. 13Ma lee, e nwere obi ụtọ, na-egwuri egwu;
igbu ehi na igbu atụrụ,
iri anụ nakwa ịṅụ mmanya.
Unu na-asị, “Ka anyị rienụ, ṅụọkwanụ,
nʼihi na echi ka anyị ga-anwụ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.