Aịzaya 22:10
Isaiah 22:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu gụrụ ụlọ dị na Jerusalem ọnụ, tiwaa ụfọdụ ụlọ iji mee ka mgbidi sie ike.
Isaiah 22:10 in English
Isaiah 22:10 · Berean Standard Bible
You counted the houses of Jerusalem and tore them down to strengthen the wall.
Context
8Onyenwe anyị wezugara ihe nchedo niile nke Juda,
nʼụbọchị ahụ unu legidere anya
na ngwa agha dị nʼỤlọeze dị nʼOke ọhịa. 9Unu hụrụ na mgbidi obodo Devid
nwere ọtụtụ mgbawa nʼebe dị iche iche na ya.
Unu chekọtara mmiri
nʼọdọ mmiri nke ala ala. 10Unu gụrụ ụlọ dị na Jerusalem ọnụ,
tiwaa ụfọdụ ụlọ iji mee ka mgbidi sie ike. 11Unu gwuru ọdọ mmiri nʼetiti mgbidi abụọ
maka ichekwa mmiri si nʼọdọ mmiri ochie,
ma unu elekwasịghị Onye ahụ kere ya anya,
unu ejikwaghị Onye ahụ tụrụ atụmatụ ya site na mgbe gara aga kpọrọ ihe. 12Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
kpọrọ unu ụbọchị ahụ
ka unu kwaa akwa, ruo ụjụ,
kpụchaa agịrị isi unu ma yirikwa akwa mkpe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.