Native Bible

Isaiah 18:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Unu niile bi nʼelu ụwa dum, na unu ndị nwere ebe obibi nʼụwa, geenụ m ntị. Mgbe e buliri ọkọlọtọ elu nʼelu ugwu niile, lee anya; mgbe a fụrụ opi ike, gee ntị.

Isaiah 18:3 in English

Isaiah 18:3 · Berean Standard Bible

All you people of the world and dwellers of the earth, when a banner is raised on the mountains, you will see it; when a ram’s horn sounds, you will hear it.

Context

1Ahụhụ ga-adịrị ala ahụ a na-anụ ụzụ ọtụtụ nku nʼime ya,* ala ahụ dị nʼofe iyi ukwu niile nke Kush.* 2Ala nke na-ezipụ ndị ozi ya site nʼosimiri, bụ ndị na-eji ụgbọ mmiri papịrọs nʼaga nʼelu mmiri. Gaanụ ngwangwa, unu ndị ozi dị nkọ gakwuru ndị toro ogologo nke ahụ ha na-akwọ mụrụmụrụ, gakwuru ndị a na-atụ egwu nʼebe niile, mba na-achọ okwu na ụka, nke na-azọpịakwa azọpịa, ndị osimiri dị iche iche kewara ala ha. 3Unu niile bi nʼelu ụwa dum, na unu ndị nwere ebe obibi nʼụwa, geenụ m ntị. Mgbe e buliri ọkọlọtọ elu nʼelu ugwu niile, lee anya; mgbe a fụrụ opi ike, gee ntị. 4Nʼihi na ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị gwara m, “Aga m anọ jụụ na-elepụ anya site nʼebe obibi m, dịka mgbe igirigi na-ada nʼoge okpomọkụ nke owuwe ihe ubi, na dịka anyanwụ si acha nʼoge okpomọkụ.” 5Nʼihi na tupu oge owuwe ihe ubi eruo, mgbe ifuru dapụsịrị, mgbe okoko na-aghọ mkpụrụ vaịnị nke ka na-achata achata, ọ ga-eji mma oge gbuchapụ ụmụ alaka ya, ọ ga-egbutu ma wezugakwa alaka ndị ahụ na-awasa awasa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.