Aịzaya 18:2
Isaiah 18:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ala nke na-ezipụ ndị ozi ya site nʼosimiri, bụ ndị na-eji ụgbọ mmiri papịrọs nʼaga nʼelu mmiri. Gaanụ ngwangwa, unu ndị ozi dị nkọ gakwuru ndị toro ogologo nke ahụ ha na-akwọ mụrụmụrụ, gakwuru ndị a na-atụ egwu nʼebe niile, mba na-achọ okwu na ụka, nke na-azọpịakwa azọpịa, ndị osimiri dị iche iche kewara ala ha.
Isaiah 18:2 in English
Isaiah 18:2 · Berean Standard Bible
which sends couriers by sea, in papyrus vessels on the waters. Go, swift messengers, to a people tall and smooth-skinned, to a people widely feared, to a powerful nation of strange speech, whose land is divided by rivers.
Context
1Ahụhụ ga-adịrị ala ahụ a na-anụ ụzụ ọtụtụ nku nʼime ya,*
ala ahụ dị nʼofe iyi ukwu niile nke Kush.* 2Ala nke na-ezipụ ndị ozi ya site nʼosimiri,
bụ ndị na-eji ụgbọ mmiri papịrọs nʼaga nʼelu mmiri.
Gaanụ ngwangwa, unu ndị ozi dị nkọ
gakwuru ndị toro ogologo nke ahụ ha na-akwọ mụrụmụrụ,
gakwuru ndị a na-atụ egwu nʼebe niile,
mba na-achọ okwu na ụka, nke na-azọpịakwa azọpịa,
ndị osimiri dị iche iche kewara ala ha. 3Unu niile bi nʼelu ụwa dum,
na unu ndị nwere ebe obibi nʼụwa, geenụ m ntị.
Mgbe e buliri ọkọlọtọ elu nʼelu ugwu niile,
lee anya;
mgbe a fụrụ opi ike,
gee ntị. 4Nʼihi na ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị gwara m,
“Aga m anọ jụụ na-elepụ anya site nʼebe obibi m,
dịka mgbe igirigi na-ada nʼoge okpomọkụ nke owuwe ihe ubi,
na dịka anyanwụ si acha nʼoge okpomọkụ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.