Aịzaya 18:5
Isaiah 18:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na tupu oge owuwe ihe ubi eruo, mgbe ifuru dapụsịrị, mgbe okoko na-aghọ mkpụrụ vaịnị nke ka na-achata achata, ọ ga-eji mma oge gbuchapụ ụmụ alaka ya, ọ ga-egbutu ma wezugakwa alaka ndị ahụ na-awasa awasa.
Isaiah 18:5 in English
Isaiah 18:5 · Berean Standard Bible
For before the harvest, when the blossom is gone and the flower becomes a ripening grape, He will cut off the shoots with a pruning knife and remove and discard the branches.
Context
3Unu niile bi nʼelu ụwa dum,
na unu ndị nwere ebe obibi nʼụwa, geenụ m ntị.
Mgbe e buliri ọkọlọtọ elu nʼelu ugwu niile,
lee anya;
mgbe a fụrụ opi ike,
gee ntị. 4Nʼihi na ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị gwara m,
“Aga m anọ jụụ na-elepụ anya site nʼebe obibi m,
dịka mgbe igirigi na-ada nʼoge okpomọkụ nke owuwe ihe ubi,
na dịka anyanwụ si acha nʼoge okpomọkụ.” 5Nʼihi na tupu oge owuwe ihe ubi eruo, mgbe ifuru dapụsịrị,
mgbe okoko na-aghọ mkpụrụ vaịnị nke ka na-achata achata,
ọ ga-eji mma oge gbuchapụ ụmụ alaka ya,
ọ ga-egbutu ma wezugakwa alaka ndị ahụ na-awasa awasa. 6A ga-ahapụ ozu ndị agha ha
ka anụ ufe nke ugwu na ụmụ anụ ọhịa rie ha.
Ụmụ nnụnụ ga-eri anụ ha nʼoge okpomọkụ,
ma ụmụ anụ ọhịa ga-eri ha nʼoge oyi. 7Ma mgbe ahụ, a ga-ewetara Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile onyinye dị iche iche,
site na ndị toro ogologo, ndị ahụ na-akwọ mụrụmụrụ,
site na ndị a na-atụ egwu nʼebe niile,
bụ mba ndị okwu na ụka,* nke na-azọpịakwa azọpịa,
ndị osimiri dị iche iche kewara ala ha.
A ga-eweta onyinye* a nʼUgwu Zayọn, nʼebe ahụ a na-akpọku aha Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
18:1 Maọbụ, ụzụ igurube
18:1 Nʼoge Aịzaya onye amụma, ndị Kush nʼachị Ijipt. Mgbe ha chọrọ ibuso ndị Asịrịa agha, ha rịọrọ ndị Palestin ka ha nyere ha aka.
18:7 Maọbụ, asụsụ dị iche
18:7 Abụ 72:10; Aịz 16:2; Zef 3:10
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.