Aịzaya 13:2
Isaiah 13:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Welienụ ọkọlọtọ agha nʼelu ugwu tọgbọrọ nʼefu. Kpọkuonụ ndị agha. Feerenụ ha aka, ka ha site nʼọnụ ụzọ ama nke ndị a maara aha ha bata nʼime obodo ukwu ahụ na-anya isi.
Isaiah 13:2 in English
Isaiah 13:2 · Berean Standard Bible
Raise a banner on a barren hilltop; call aloud to them. Wave your hand, that they may enter the gates of the nobles.
Context
1Nke a bụ amụma megide Babilọn nke Aịzaya nwa Emọz hụrụ. 2Welienụ ọkọlọtọ agha nʼelu ugwu tọgbọrọ nʼefu.
Kpọkuonụ ndị agha.
Feerenụ ha aka,
ka ha site nʼọnụ ụzọ ama nke ndị a maara aha ha bata nʼime obodo ukwu ahụ na-anya isi. 3Enyela m ndị m kwadoro maka agha iwu;
akpọọla m ndị ọka agha m oku, bụ ndị na-aṅụrị ọṅụ na mmeri m, ka ha gosipụta oke iwe m.
E, ndị m kpọrọ bụ ndị ahụ na-aṅụrị ọṅụ ịhụ na m meriri ndị iro m. 4Gee ntị nụrụ ụzụ na-ada nʼugwu niile;
gee ntị nụrụ ụzụ yiri ụzụ nke igwe mmadụ na-eme.
Gee ntị nụrụ mkpọtụ na-ada nʼetiti alaeze dị iche iche.
Dịka mkpọtụ na-eme mgbe ọtụtụ mba na-ezukọta nʼotu ebe.
Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile
na-achịkọta ndị agha ya nʼihi ibu agha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.