Native Bible

Isaiah 13:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nke a bụ amụma megide Babilọn nke Aịzaya nwa Emọz hụrụ.

Isaiah 13:1 in English

Isaiah 13:1 · Berean Standard Bible

This is the burden against Babylon that Isaiah son of Amoz received:

Context

1Nke a bụ amụma megide Babilọn nke Aịzaya nwa Emọz hụrụ. 2Welienụ ọkọlọtọ agha nʼelu ugwu tọgbọrọ nʼefu. Kpọkuonụ ndị agha. Feerenụ ha aka, ka ha site nʼọnụ ụzọ ama nke ndị a maara aha ha bata nʼime obodo ukwu ahụ na-anya isi. 3Enyela m ndị m kwadoro maka agha iwu; akpọọla m ndị ọka agha m oku, bụ ndị na-aṅụrị ọṅụ na mmeri m, ka ha gosipụta oke iwe m. E, ndị m kpọrọ bụ ndị ahụ na-aṅụrị ọṅụ ịhụ na m meriri ndị iro m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.