Aịzaya 10:5
Isaiah 10:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ahụhụ ga-adịrị Asịrịa onye bụ mkpara nke iwe m. Nʼaka ya ka mkpọ nke ọnụma* m dị.
Isaiah 10:5 in English
Isaiah 10:5 · Berean Standard Bible
Woe to Assyria, the rod of My anger; the staff in their hands is My wrath.
Context
3Gịnị ka unu ga-eme nʼụbọchị m ga-abịa ileta unu?
Gịnị ka unu ga-eme nʼụbọchị m ga-eweta ịla nʼiyi, nke ga-esi nʼebe dị anya bịara unu?
Onye ka unu ga-agbakwuru maka enyemaka?
Ọ bụ ebe ka unu ga-ahapụ akụ unu niile? 4Mba, ọ dịghị ihe ga-afọdụ; karịa na a ga-egbu unu nʼihu ọgụ,
maọbụ dọkpụrụ unu dịka ndị mkpọrọ.
Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ,
aka ya ka setịpụkwara esetipụ. 5“Ahụhụ ga-adịrị Asịrịa onye bụ mkpara nke iwe m.
Nʼaka ya ka mkpọ nke ọnụma* m dị. 6Ana m ezipu ya imegide mba a na-amaghị Chineke,
m na-eziga ya imegide ndị na-akpasu m iwe,
ka ha kwakọrọ ihe nkwata nʼagha ha, pụnakwara ha ụfọdụ nʼike,
nakwa ịzọtọ ndị ha niile nʼala dịka apịtị nke okporoụzọ. 7Ma ọ bụghị ihe a ka o zubere,
nke a abụghị ihe ọ na-eche nʼobi ya;
o zubere ịla ndị m nʼiyi,
na ibibi ọtụtụ mba dị iche iche.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.