Aịzaya 10:4
Isaiah 10:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mba, ọ dịghị ihe ga-afọdụ; karịa na a ga-egbu unu nʼihu ọgụ, maọbụ dọkpụrụ unu dịka ndị mkpọrọ. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ, aka ya ka setịpụkwara esetipụ.
Isaiah 10:4 in English
Isaiah 10:4 · Berean Standard Bible
Nothing will remain but to crouch among the captives or fall among the slain. Despite all this, His anger is not turned away; His hand is still upraised.
Context
2iji napụ ndị ogbenye ihe ruru ha
nakwa ịnapụ ndị m a na-emegbu emegbu ikpe ziri ezi,
na-emekwa ka ụmụ nwanyị di ha nwụrụ bụrụ anụ oriri ha
na izunara ụmụ na-enweghị nne na nna ihe ha nwere. 3Gịnị ka unu ga-eme nʼụbọchị m ga-abịa ileta unu?
Gịnị ka unu ga-eme nʼụbọchị m ga-eweta ịla nʼiyi, nke ga-esi nʼebe dị anya bịara unu?
Onye ka unu ga-agbakwuru maka enyemaka?
Ọ bụ ebe ka unu ga-ahapụ akụ unu niile? 4Mba, ọ dịghị ihe ga-afọdụ; karịa na a ga-egbu unu nʼihu ọgụ,
maọbụ dọkpụrụ unu dịka ndị mkpọrọ.
Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ,
aka ya ka setịpụkwara esetipụ. 5“Ahụhụ ga-adịrị Asịrịa onye bụ mkpara nke iwe m.
Nʼaka ya ka mkpọ nke ọnụma* m dị. 6Ana m ezipu ya imegide mba a na-amaghị Chineke,
m na-eziga ya imegide ndị na-akpasu m iwe,
ka ha kwakọrọ ihe nkwata nʼagha ha, pụnakwara ha ụfọdụ nʼike,
nakwa ịzọtọ ndị ha niile nʼala dịka apịtị nke okporoụzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.