Native Bible

Isaiah 10:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Gịnị ka unu ga-eme nʼụbọchị m ga-abịa ileta unu? Gịnị ka unu ga-eme nʼụbọchị m ga-eweta ịla nʼiyi, nke ga-esi nʼebe dị anya bịara unu? Onye ka unu ga-agbakwuru maka enyemaka? Ọ bụ ebe ka unu ga-ahapụ akụ unu niile?

Isaiah 10:3 in English

Isaiah 10:3 · Berean Standard Bible

What will you do on the day of reckoning when devastation comes from afar? To whom will you flee for help? Where will you leave your wealth?

Context

1Ahụhụ na-adịrị ndị niile na-atụpụta iwu na-ezighị ezi; ndị niile na-atụpụta iwu mmegbu, 2iji napụ ndị ogbenye ihe ruru ha nakwa ịnapụ ndị m a na-emegbu emegbu ikpe ziri ezi, na-emekwa ka ụmụ nwanyị di ha nwụrụ bụrụ anụ oriri ha na izunara ụmụ na-enweghị nne na nna ihe ha nwere. 3Gịnị ka unu ga-eme nʼụbọchị m ga-abịa ileta unu? Gịnị ka unu ga-eme nʼụbọchị m ga-eweta ịla nʼiyi, nke ga-esi nʼebe dị anya bịara unu? Onye ka unu ga-agbakwuru maka enyemaka? Ọ bụ ebe ka unu ga-ahapụ akụ unu niile? 4Mba, ọ dịghị ihe ga-afọdụ; karịa na a ga-egbu unu nʼihu ọgụ, maọbụ dọkpụrụ unu dịka ndị mkpọrọ. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ, aka ya ka setịpụkwara esetipụ. 5“Ahụhụ ga-adịrị Asịrịa onye bụ mkpara nke iwe m. Nʼaka ya ka mkpọ nke ọnụma* m dị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.