Hosiya 5:3
Hosea 5:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Amaara m ihe niile gbasara Ifrem, ọ dịkwaghị ihe zoro ezo banyere Izrel nʼebe m nọ. Gị Ifrem, ugbu a ị gbawala akwụna; gị Izrel, emerụọkwala gị.
Hosea 5:3 in English
Hosea 5:3 · Berean Standard Bible
I know all about Ephraim,* and Israel is not hidden from Me. For now, O Ephraim, you have turned to prostitution; Israel is defiled.
Context
1“Nụrụnụ nke a, unu ndị nchụaja!
Geenụ ntị, unu ụlọ Izrel!
Geenụ ntị, unu ndị ezinaụlọ eze.
Nʼihi na ọ bụ unu ka ikpe ahụ gbasara.
Nʼihi na unu abụrụla ihe ị maa nʼọnya na Mizpa,
na ụgbụ agbasara nʼelu Taboa. 2Ndị nnupu isi ahụ abamiela ime nʼigbu mmadụ,
aga m ata ha niile ahụhụ. 3Amaara m ihe niile gbasara Ifrem,
ọ dịkwaghị ihe zoro ezo banyere Izrel nʼebe m nọ.
Gị Ifrem, ugbu a ị gbawala akwụna;
gị Izrel, emerụọkwala gị. 4“Omume ha agaghị ekwe
ka ha laghachikwute Chineke ha,
nʼihi na mmụọ nke ịkwa iko ewerela ute biri nʼime ha,
ha amaghịkwa Onyenwe anyị. 5Mpako niile nke Izrel na-agba ama megide ha,
Ọ bụladị Izrel na Ifrem na-asọ ngọngọ nʼime mmehie ha,
Juda, nʼonwe ya, soo ha na-asọ ngọngọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.