Hosiya 5:2
Hosea 5:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị nnupu isi ahụ abamiela ime nʼigbu mmadụ, aga m ata ha niile ahụhụ.
Hosea 5:2 in English
Hosea 5:2 · Berean Standard Bible
The rebels are deep in slaughter; but I will chastise them all.
Context
1“Nụrụnụ nke a, unu ndị nchụaja!
Geenụ ntị, unu ụlọ Izrel!
Geenụ ntị, unu ndị ezinaụlọ eze.
Nʼihi na ọ bụ unu ka ikpe ahụ gbasara.
Nʼihi na unu abụrụla ihe ị maa nʼọnya na Mizpa,
na ụgbụ agbasara nʼelu Taboa. 2Ndị nnupu isi ahụ abamiela ime nʼigbu mmadụ,
aga m ata ha niile ahụhụ. 3Amaara m ihe niile gbasara Ifrem,
ọ dịkwaghị ihe zoro ezo banyere Izrel nʼebe m nọ.
Gị Ifrem, ugbu a ị gbawala akwụna;
gị Izrel, emerụọkwala gị. 4“Omume ha agaghị ekwe
ka ha laghachikwute Chineke ha,
nʼihi na mmụọ nke ịkwa iko ewerela ute biri nʼime ha,
ha amaghịkwa Onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.