Native Bible

Hosea 13:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Aga m anapụta ha site nʼike nke Ala mmụọ. Aga m agbapụta ha site nʼọnwụ. Gị ọnwụ, olee ebe ajọọ ọrịa gị niile na-efe efe dị? Gị ala mmụọ, olee ebe ike ịla nʼiyi gị dị? “Agaghị m enwe ọmịiko ọbụla,

Hosea 13:14 in English

Hosea 13:14 · Berean Standard Bible

I will ransom them from the power of Sheol; I will redeem them from Death.* Where, O Death, are your plagues? Where, O Sheol, is your sting?* Compassion is hidden from My eyes.

Context

12Njehie nke Ifrem ka e kechikọtara debe; a na-edetukwa mmehie ya niile nʼakwụkwọ. 13Ihe mgbu nke dịka ihe mgbu nwanyị ime na-eme na-abịakwasị ya; maọbụ nwantakịrị na-enweghị uche. Mgbe oge ya zuru, ọ jụrụ ịpụta site nʼọnụ akpanwa ka a mụpụta ya. 14“Aga m anapụta ha site nʼike nke Ala mmụọ. Aga m agbapụta ha site nʼọnwụ. Gị ọnwụ, olee ebe ajọọ ọrịa gị niile na-efe efe dị? Gị ala mmụọ, olee ebe ike ịla nʼiyi gị dị? “Agaghị m enwe ọmịiko ọbụla, 15ọ bụ ezie na ya onwe ya bụ onye na-amị mkpụrụ nʼetiti ụmụnne ya niile. Ma oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ, nke Onyenwe anyị zitere, ga-esi nʼọzara fekwasị ya. Isi iyi niile ga-ata, olulu mmiri ya ga-atakọrọkwa. A ga-apụnara ya ihe dị nʼụlọakụ ya niile, na akụ niile o nwere. 16Sameria aghaghị ịta ahụhụ ikpe ọmụma ya, nʼihi na o nupuru isi megide Chineke ha. A ga-eji mma agha gbuo ndị ya niile, tụpịa ụmụntakịrị ya niile nʼala, jirikwa mma agha bọwaa ndị inyom niile dị ime.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.