Hosiya 13:14
Hosea 13:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Aga m anapụta ha site nʼike nke Ala mmụọ. Aga m agbapụta ha site nʼọnwụ. Gị ọnwụ, olee ebe ajọọ ọrịa gị niile na-efe efe dị? Gị ala mmụọ, olee ebe ike ịla nʼiyi gị dị? “Agaghị m enwe ọmịiko ọbụla,
Hosea 13:14 in English
Hosea 13:14 · Berean Standard Bible
I will ransom them from the power of Sheol; I will redeem them from Death.* Where, O Death, are your plagues? Where, O Sheol, is your sting?* Compassion is hidden from My eyes.
Context
12Njehie nke Ifrem ka e kechikọtara debe;
a na-edetukwa mmehie ya niile nʼakwụkwọ. 13Ihe mgbu nke dịka ihe mgbu nwanyị ime na-eme na-abịakwasị ya;
maọbụ nwantakịrị na-enweghị uche.
Mgbe oge ya zuru,
ọ jụrụ ịpụta site nʼọnụ akpanwa ka a mụpụta ya. 14“Aga m anapụta ha site nʼike nke Ala mmụọ.
Aga m agbapụta ha site nʼọnwụ.
Gị ọnwụ, olee ebe ajọọ ọrịa gị niile na-efe efe dị?
Gị ala mmụọ, olee ebe ike ịla nʼiyi gị dị?
“Agaghị m enwe ọmịiko ọbụla, 15ọ bụ ezie na ya onwe ya bụ onye na-amị mkpụrụ nʼetiti ụmụnne ya niile.
Ma oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ, nke Onyenwe anyị zitere,
ga-esi nʼọzara fekwasị ya.
Isi iyi niile ga-ata,
olulu mmiri ya ga-atakọrọkwa.
A ga-apụnara ya ihe dị nʼụlọakụ ya niile,
na akụ niile o nwere. 16Sameria aghaghị ịta ahụhụ ikpe ọmụma ya,
nʼihi na o nupuru isi megide Chineke ha.
A ga-eji mma agha gbuo ndị ya niile,
tụpịa ụmụntakịrị ya niile nʼala,
jirikwa mma agha bọwaa ndị inyom niile dị ime.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.