Hosiya 13:16
Hosea 13:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Sameria aghaghị ịta ahụhụ ikpe ọmụma ya, nʼihi na o nupuru isi megide Chineke ha. A ga-eji mma agha gbuo ndị ya niile, tụpịa ụmụntakịrị ya niile nʼala, jirikwa mma agha bọwaa ndị inyom niile dị ime.”
Hosea 13:16 in English
Hosea 13:16 · Berean Standard Bible
Samaria will bear her guilt because she has rebelled against her God. They will fall by the sword; their little ones will be dashed to pieces, and their pregnant women ripped open.
Context
14“Aga m anapụta ha site nʼike nke Ala mmụọ.
Aga m agbapụta ha site nʼọnwụ.
Gị ọnwụ, olee ebe ajọọ ọrịa gị niile na-efe efe dị?
Gị ala mmụọ, olee ebe ike ịla nʼiyi gị dị?
“Agaghị m enwe ọmịiko ọbụla, 15ọ bụ ezie na ya onwe ya bụ onye na-amị mkpụrụ nʼetiti ụmụnne ya niile.
Ma oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ, nke Onyenwe anyị zitere,
ga-esi nʼọzara fekwasị ya.
Isi iyi niile ga-ata,
olulu mmiri ya ga-atakọrọkwa.
A ga-apụnara ya ihe dị nʼụlọakụ ya niile,
na akụ niile o nwere. 16Sameria aghaghị ịta ahụhụ ikpe ọmụma ya,
nʼihi na o nupuru isi megide Chineke ha.
A ga-eji mma agha gbuo ndị ya niile,
tụpịa ụmụntakịrị ya niile nʼala,
jirikwa mma agha bọwaa ndị inyom niile dị ime.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.