Native Bible

Hosea 13:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ebee ka ndị eze gị nọ, ka ha bịa zọpụta gị? Ebee ka ndịisi ọchịchị nke obodo gị niile nọ, bụ ndị ahụ i ji nʼihi ha na-asị, ‘Nye m eze na ndị ọchịchị’?

Hosea 13:10 in English

Hosea 13:10 · Berean Standard Bible

Where is your king now * to save you in all your cities, and the rulers to whom you said, “Give me a king and princes”?

Context

8Aga m adakwasị ha dịka anụ ọhịa bịa nke a gbabara aka ụmụ ya, dọwasịa anụ ahụ kpuchiri obi ha aga m eripịa ha dịka ọdụm, anụ ọhịa ga-adọkasịkwa ha. 9“Aga m ala gị nʼiyi, gị Izrel, onye pụrụ inyere gị aka? 10Ebee ka ndị eze gị nọ, ka ha bịa zọpụta gị? Ebee ka ndịisi ọchịchị nke obodo gị niile nọ, bụ ndị ahụ i ji nʼihi ha na-asị, ‘Nye m eze na ndị ọchịchị’? 11Esitere m nʼiwe m nye gị eze, sitekwa nʼọnụma m, napụ gị ya. 12Njehie nke Ifrem ka e kechikọtara debe; a na-edetukwa mmehie ya niile nʼakwụkwọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.