Native Bible

Hosea 12:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụkwa onye amụma ka Onyenwe anyị ji site nʼIjipt kpọpụta Izrel, o sitekwara nʼaka onye amụma lekọtazie ya anya.

Hosea 12:13 in English

Hosea 12:13 · Berean Standard Bible

But by a prophet the LORD brought Israel out of Egypt, and by a prophet he was preserved.

Context

11Gilead ọ na-eme ajọ ihe? Ndị ya bụ ndị efulefu. Ha na-achụ aja oke ehi dị iche iche na Gilgal? Ebe ịchụ aja ha niile ga a dịka ebe a chịkọtara ukwu nkume, nke dị nʼubi a kọrọ akọ. 12Jekọb gbalagara nʼala Aram; Izrel fere ofufe nʼihi inweta nwunye, nʼihi ịkwụ ụgwọ ya, o lekọtara atụrụ. 13Ọ bụkwa onye amụma ka Onyenwe anyị ji site nʼIjipt kpọpụta Izrel, o sitekwara nʼaka onye amụma lekọtazie ya anya. 14Ma Ifrem akpasuola iwe ilu nke ukwuu. Onyenwe ya ga-awụkwasịkwa ya ikpe ọmụma. Ọ ga-akwụghachi ya dịka nlelị ya si dị. 12:2 Jekọb nʼebe a bụ akpalaokwu nke pụtara onye aghụghọ Maọbụ, onye na-aghọrị mmadụ

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.