Ndị Hibru 5:6
Hebrews 5:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼebe ọzọ, o kwuru, “Dị ka usoro Melkizedek si dị, ị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi.”*
Hebrews 5:6 in English
Hebrews 5:6 · Berean Standard Bible
And in another passage God says: “You are a priest forever in the order of Melchizedek.”*
Context
4O nweghị onye na-ewere ugwu a nʼonwe ya, kama ọ bụ Chineke na-akpọ dịka o si kpọọ Erọn. 5Nʼotu aka ahụ kwa, Kraịst enyeghị onwe ya ebube nke ịbụ onyeisi nchụaja, kama Chineke sịrị ya,
“Ị bụ Ọkpara m.
Taa abụrụla m Nna gị.”* 6Nʼebe ọzọ, o kwuru,
“Dị ka usoro Melkizedek si dị,
ị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi.”* 7Mgbe ọ ka dị ndụ nʼanụ ahụ, o ji oke olu na anya mmiri kpee ekpere rịọkwa arịrịọ nye onye ahụ pụrụ ịzọpụta ya site nʼọnwụ. A nụkwara olu ya nʼihi ndụ nrube isi na mweda nʼala ya. 8Ọ bụ ezie na ọ bụ Ọkpara ma ọ mụtara irube isi site nʼahụhụ ọ tara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.