Ndị Hibru 3:7
Hebrews 3:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, dị ka Mmụọ Nsọ na-asị, “Ọ bụrụ na unu anụ olu ya taa,
Hebrews 3:7 in English
Hebrews 3:7 · Berean Standard Bible
Therefore, as the Holy Spirit says: “Today, if you hear His voice,
Context
5Mosis kwesiri ntụkwasị obi dịka odibo nʼụlọ Chineke nʼihe niile,* sịkwa otu a gbaa ama banyere ihe ndị a ga-ekwu nʼọdịnihu. 6Ma otu ọ dị, Kraịst kwesiri ntụkwasị obi dịka ọkpara nke na-elekọta ụlọ ya. Anyị gabụkwanụ ụlọ ya ma ọ bụrụ na anyị ejidesie okwukwe anyị ike ya na olileanya nke anyị ji anya isi. 7Ya mere, dị ka Mmụọ Nsọ na-asị,
“Ọ bụrụ na unu anụ olu ya taa, 8unu emela ka obi unu sie ike,
dị ka unu mere nʼoge nnupu isi
mgbe oge ọnwụnwa nʼime ọzara, 9ebe nna nna unu ha nọrọ nwa m ọnwụnwa.
Ọ bụ ezie na ha hụrụ akaọrụ m iri afọ anọ ndị a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.