Ndị Hibru 3:17
Hebrews 3:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụkwa olee ndị ka o wesoro iwe iri afọ anọ? Ọ bụ na ọ bụghị ndị ahụ mehiere. Ndị ahụ ahụ ha dara nʼọzara?
Hebrews 3:17 in English
Hebrews 3:17 · Berean Standard Bible
And with whom was God angry for forty years? Was it not with those who sinned, whose bodies fell in the wilderness?
Context
15Dị ka e kwuru ya,
“Taa, ọ bụrụ na unu anụ olu ya.
Unu emela ka obi unu sie ike,
dịka unu mere nʼoge nnupu isi.”* 16Olee ndị bụ ndị ahụ nụrụ ma nupu isi? Ọ bụ na ọ bụghị ndị niile ahụ Mosis dupụtara site nʼala Ijipt? 17Ọ bụkwa olee ndị ka o wesoro iwe iri afọ anọ? Ọ bụ na ọ bụghị ndị ahụ mehiere. Ndị ahụ ahụ ha dara nʼọzara? 18Olee ndị ahụ ọ ṅụụrụ iyi na ha agaghị aba nʼizuike ya? Ọ bụ na ha abụghị ndị ahụ nupuuru ya isi? 19Ugbu a, anyị maara na ha enweghị ike ịbanye, nʼihi na ha bụ ndị na-ekweghị ekwe.
3:5 Ọnụ 12:7
3:11 Abụ 95:7-11
3:15 Abụ 95:7,8
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.