Ndị Hibru 3:15
Hebrews 3:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Dị ka e kwuru ya, “Taa, ọ bụrụ na unu anụ olu ya. Unu emela ka obi unu sie ike, dịka unu mere nʼoge nnupu isi.”*
Hebrews 3:15 in English
Hebrews 3:15 · Berean Standard Bible
As it has been said: “Today, if you hear His voice, do not harden your hearts, as you did in the rebellion.”*
Context
13Kama, na-agbanụ onwe unu ume kwa ụbọchị niile dịka a kpọrọ ụbọchị ahụ Taa. Ka a hapụ inwekwa onye ọbụla a ga-esite nʼaghụghọ nke mmehie mee ka obi ya sie ike. 14Anyị bụ ndị anyị na Kraịst ga-eso kekọrịta oke ma ọ bụrụ na anyị ga-ejidesi ya ike bụ ntụkwasị obi ahụ anyị nwere site na mmalite ruo ọgwụgwụ. 15Dị ka e kwuru ya,
“Taa, ọ bụrụ na unu anụ olu ya.
Unu emela ka obi unu sie ike,
dịka unu mere nʼoge nnupu isi.”* 16Olee ndị bụ ndị ahụ nụrụ ma nupu isi? Ọ bụ na ọ bụghị ndị niile ahụ Mosis dupụtara site nʼala Ijipt? 17Ọ bụkwa olee ndị ka o wesoro iwe iri afọ anọ? Ọ bụ na ọ bụghị ndị ahụ mehiere. Ndị ahụ ahụ ha dara nʼọzara?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.