Ndị Hibru 1:9
Hebrews 1:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị hụrụ ezi omume nʼanya ma kpọọ ihe ọjọọ asị. Nʼihi nke a, Chineke, nke bụ Chineke gị, emeela ka ịdị elu karịa ndị ibe gị niile site na ite gị mmanụ nke ọṅụ.”*
Hebrews 1:9 in English
Hebrews 1:9 · Berean Standard Bible
You have loved righteousness and hated wickedness; therefore God, Your God, has anointed You above Your companions with the oil of joy.”*
Context
7O kwukwara banyere ndị mmụọ ozi ya, ọ sịrị,
“Ọ na-eme ndị mmụọ ozi ya ka ha bụrụ ikuku,
na-emekwa ndị na-ejere ya ozi ka ha bụrụ ire ọkụ.”* 8Ma banyere Ọkpara ahụ, ọ sịrị,
“Ocheeze gị, O Chineke, ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Mkpara omume ziri ezi ka mkpara alaeze gị ga-abụ. 9Ị hụrụ ezi omume nʼanya ma kpọọ ihe ọjọọ asị.
Nʼihi nke a, Chineke, nke bụ Chineke gị, emeela ka ịdị elu karịa ndị ibe gị niile
site na ite gị mmanụ nke ọṅụ.”* 10Ọ sịkwara,
“Na mmalite, Onyenwe anyị, ọ bụ gị tọrọ ntọala ụwa,
eluigwe bụkwa ọrụ aka gị. 11Ha ga-ala nʼiyi, ma gị onwe gị ga-anọgide.
Ha niile ga-aka nka dịka uwe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.