Ndị Hibru 1:7
Hebrews 1:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O kwukwara banyere ndị mmụọ ozi ya, ọ sịrị, “Ọ na-eme ndị mmụọ ozi ya ka ha bụrụ ikuku, na-emekwa ndị na-ejere ya ozi ka ha bụrụ ire ọkụ.”*
Hebrews 1:7 in English
Hebrews 1:7 · Berean Standard Bible
Now about the angels He says: “He makes His angels winds, His servants flames of fire.”*
Context
5Onye nʼetiti ndị mmụọ ozi ka ọ gwarala sị,
“Ị bụ Ọkpara m.
Taa abụrụla m Nna gị”*?
Maọbụ ọzọkwa,
“Aga m abụrụ ya Nna,
ya onwe ya ga-abụkwara m Nwa”*? 6Ọzọkwa, mgbe o mere ka nwa mbụ ya bịa nʼụwa, o nyere iwu sị,
“Ka ndị mmụọ ozi Chineke niile fee ya ofufe.”* 7O kwukwara banyere ndị mmụọ ozi ya, ọ sịrị,
“Ọ na-eme ndị mmụọ ozi ya ka ha bụrụ ikuku,
na-emekwa ndị na-ejere ya ozi ka ha bụrụ ire ọkụ.”* 8Ma banyere Ọkpara ahụ, ọ sịrị,
“Ocheeze gị, O Chineke, ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Mkpara omume ziri ezi ka mkpara alaeze gị ga-abụ. 9Ị hụrụ ezi omume nʼanya ma kpọọ ihe ọjọọ asị.
Nʼihi nke a, Chineke, nke bụ Chineke gị, emeela ka ịdị elu karịa ndị ibe gị niile
site na ite gị mmanụ nke ọṅụ.”*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.