Ndị Hibru 1:6
Hebrews 1:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọzọkwa, mgbe o mere ka nwa mbụ ya bịa nʼụwa, o nyere iwu sị, “Ka ndị mmụọ ozi Chineke niile fee ya ofufe.”*
Hebrews 1:6 in English
Hebrews 1:6 · Berean Standard Bible
And again, when God brings His firstborn into the world, He says: “Let all God’s angels worship Him.”*
Context
4Ya mere, ọ bụrụla onye dị ukwu karịa ndị mmụọ ozi dị ka aha e nyere ya si dị elu karịa nke ha. 5Onye nʼetiti ndị mmụọ ozi ka ọ gwarala sị,
“Ị bụ Ọkpara m.
Taa abụrụla m Nna gị”*?
Maọbụ ọzọkwa,
“Aga m abụrụ ya Nna,
ya onwe ya ga-abụkwara m Nwa”*? 6Ọzọkwa, mgbe o mere ka nwa mbụ ya bịa nʼụwa, o nyere iwu sị,
“Ka ndị mmụọ ozi Chineke niile fee ya ofufe.”* 7O kwukwara banyere ndị mmụọ ozi ya, ọ sịrị,
“Ọ na-eme ndị mmụọ ozi ya ka ha bụrụ ikuku,
na-emekwa ndị na-ejere ya ozi ka ha bụrụ ire ọkụ.”* 8Ma banyere Ọkpara ahụ, ọ sịrị,
“Ocheeze gị, O Chineke, ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Mkpara omume ziri ezi ka mkpara alaeze gị ga-abụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.