Ndị Hibru 1:10
Hebrews 1:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ sịkwara, “Na mmalite, Onyenwe anyị, ọ bụ gị tọrọ ntọala ụwa, eluigwe bụkwa ọrụ aka gị.
Hebrews 1:10 in English
Hebrews 1:10 · Berean Standard Bible
And: “In the beginning, O Lord, You laid the foundations of the earth, and the heavens are the work of Your hands.
Context
8Ma banyere Ọkpara ahụ, ọ sịrị,
“Ocheeze gị, O Chineke, ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Mkpara omume ziri ezi ka mkpara alaeze gị ga-abụ. 9Ị hụrụ ezi omume nʼanya ma kpọọ ihe ọjọọ asị.
Nʼihi nke a, Chineke, nke bụ Chineke gị, emeela ka ịdị elu karịa ndị ibe gị niile
site na ite gị mmanụ nke ọṅụ.”* 10Ọ sịkwara,
“Na mmalite, Onyenwe anyị, ọ bụ gị tọrọ ntọala ụwa,
eluigwe bụkwa ọrụ aka gị. 11Ha ga-ala nʼiyi, ma gị onwe gị ga-anọgide.
Ha niile ga-aka nka dịka uwe. 12Ị ga-apịakọta ha,
gbanwee ha dị ka akwa.
Ma gị onwe gị enweghị mgbanwe.
Ọnụọgụgụ afọ gị agaghị enwe ọgwụgwụ ruo mgbe ebighị ebi.”*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.