Jenesis 9:25
Genesis 9:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
o kwuru sị, “Onye a bụrụ ọnụ ka Kenan bụ! Ohu ndị ohu, ka ọ ga-abụrụ ụmụnne ya.”
Genesis 9:25 in English
Genesis 9:25 · Berean Standard Bible
he said, “Cursed be Canaan! A servant of servants shall he be to his brothers.”
Context
23Ma Shem na Jafet weere akwa tụkwasị nʼubu ha, were azụ jere ije ruo nʼebe nna ha nọ, hapụ akwa ahụ ka ọ dakwasị nna ha kpuchikwaa ọtọ ya. Ma ha chepuru ihu nʼebe ọzọ mgbe ha na-eme nke a, nʼihi ya, ha elekwasịghị ọtọ nna ha anya. 24Mgbe Noa si nʼụra mmanya ya bilie, chọpụta ihe nwa ya nwoke nke nta mere, 25o kwuru sị,
“Onye a bụrụ ọnụ ka Kenan bụ!
Ohu ndị ohu,
ka ọ ga-abụrụ ụmụnne ya.” 26Ọ sịkwara,
“Ngọzị dịrị Onyenwe anyị Chineke Shem.
Ka Kenan bụrụ ohu Shem. 27Ka Chineke mee ka ebe obibi Jafet saa mbara,
ka Jafet biri nʼụlọ ikwu Shem,
meekwa ka Kenan bụrụ ohu ya.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.