Jenesis 9:27
Genesis 9:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka Chineke mee ka ebe obibi Jafet saa mbara, ka Jafet biri nʼụlọ ikwu Shem, meekwa ka Kenan bụrụ ohu ya.”
Genesis 9:27 in English
Genesis 9:27 · Berean Standard Bible
May God expand the territory of Japheth;* may he dwell in the tents of Shem, and may Canaan be his servant.”
Context
25o kwuru sị,
“Onye a bụrụ ọnụ ka Kenan bụ!
Ohu ndị ohu,
ka ọ ga-abụrụ ụmụnne ya.” 26Ọ sịkwara,
“Ngọzị dịrị Onyenwe anyị Chineke Shem.
Ka Kenan bụrụ ohu Shem. 27Ka Chineke mee ka ebe obibi Jafet saa mbara,
ka Jafet biri nʼụlọ ikwu Shem,
meekwa ka Kenan bụrụ ohu ya.” 28Mgbe uju mmiri ahụ gabigachara, Noa biri ndụ narị afọ atọ na iri afọ ise ọzọ. 29Ọnụọgụgụ afọ Noa niile mgbe ọ nwụrụ, bụ narị afọ itoolu na iri afọ ise.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.