Native Bible

Genesis 7:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Noa gbara narị afọ isii mgbe mmiri ukwu a bidoro izo nʼelu ụwa.

Genesis 7:6 in English

Genesis 7:6 · Berean Standard Bible

Now Noah was 600 years old when the floodwaters came upon the earth.

Context

4Nʼihi na ụbọchị asaa site taa, aga m ezidata mmiri ozuzo nʼụwa. Mmiri a ga-ezo iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị. Aga m ekpochapụ site nʼelu ụwa ihe niile nwere ndụ nke m kere.” 5Ya mere, Noa mere ihe niile Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu. 6Noa gbara narị afọ isii mgbe mmiri ukwu a bidoro izo nʼelu ụwa. 7Noa banyere nʼụgbọ mmiri ahụ, ya na ụmụ ya ndị ikom na nwunye ya, na ndị nwunye ụmụ ya ndị ikom ịgbanarị uju mmiri ahụ. 8Ụmụ anụmanụ ndị dị ọcha, na ndị na-adịghị ọcha, abụọ abụọ, tinyere anụ ufe na ihe niile e kere eke na-akpụgharị nʼala, abụọ abụọ kwa,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.