Jenesis 7:10
Genesis 7:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe abalị asaa gafere, uju mmiri ahụ bịakwasịrị ụwa.
Genesis 7:10 in English
Genesis 7:10 · Berean Standard Bible
And after seven days the floodwaters came upon the earth.
Context
8Ụmụ anụmanụ ndị dị ọcha, na ndị na-adịghị ọcha, abụọ abụọ, tinyere anụ ufe na ihe niile e kere eke na-akpụgharị nʼala, abụọ abụọ kwa, 9oke na nwunye, bịakwutere Noa soro ya banye nʼụgbọ mmiri ahụ, dịka Chineke nyere Noa nʼiwu. 10Mgbe abalị asaa gafere, uju mmiri ahụ bịakwasịrị ụwa. 11Nʼafọ narị isii nke ndụ Noa, nʼọnwa nke abụọ, nʼụbọchị nke iri na asaa, bụ ụbọchị isi iyi niile dị nʼime ime ala nupụtara nʼelu ala, mmiri niile dị na mbara eluigwe ka a hapụrụ ka ha wụdata nʼụwa. 12Mmiri zogịdere na-esepụghị aka iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.