Native Bible

Genesis 48:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe Izrel hụrụ ụmụ ndị ikom abụọ Josef kpọ bịa, ọ jụrụ Josef ajụjụ sị, “Ndị a, bụ ndị ole?”

Genesis 48:8 in English

Genesis 48:8 · Berean Standard Bible

When Israel saw the sons of Joseph, he asked, “Who are these?”

Context

6Ma ụmụ ọzọ a ga-amụtara gị ga-abụ nke gị. Ọ bụ aha ụmụnne ha ndị a ka a ga-eji mara ha nʼala nketa nke ha. 7Ana m eme nke a nʼihi na mgbe m si Padan Aram pụta, nne unu Rechel, nwụrụ nʼala Kenan mgbe anyị ka nọ nʼụzọ ije anyị nʼebe dịtụ anya site na Efrat. Nʼakụkụ ụzọ e si aga Efrat, ya bụ Betlehem, ka m likwara ya.” 8Mgbe Izrel hụrụ ụmụ ndị ikom abụọ Josef kpọ bịa, ọ jụrụ Josef ajụjụ sị, “Ndị a, bụ ndị ole?” 9Josef zara nna ya sị, “Ha bụ ụmụ ndị ikom ndị Chineke nyere m nʼebe a.” Ya mere, Jekọb gwara ya sị, “Kpọtara m ha, ka m gọzie ha.” 10Nʼoge a, Izrel adịghị ahụzikwa ụzọ nke ọma nʼihi ime agadi ya. Ya mere, Josef duuru ụmụ ya ndị ikom ndị ahụ bịa nso ebe nna ya nọ. Mgbe ahụ, Jekọb suturu ha ọnụ, makụọ ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.