Jenesis 48:6
Genesis 48:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ụmụ ọzọ a ga-amụtara gị ga-abụ nke gị. Ọ bụ aha ụmụnne ha ndị a ka a ga-eji mara ha nʼala nketa nke ha.
Genesis 48:6 in English
Genesis 48:6 · Berean Standard Bible
Any children born to you after them shall be yours, and they shall be called by the names of their brothers in the territory they inherit.
Context
4Ọ sịrị m, ‘Lee, aga m eme ka ị mịa mkpụrụ, baakwa ụba nʼọnụọgụgụ. Aga m eme ka ị ghọọ ọgbakọ ọtụtụ mba. Aga m enye gị ala a ka ọ bụrụ ihe nketa ebighị ebi maka agbụrụ gị ndị ga-esote gị.’ 5“Ugbu a, ana m eme ụmụ gị ndị ikom abụọ ndị a, ndị a mụtaara gị nʼala Ijipt, ụmụ nke m. Ha abụọ, Ifrem na Manase, ga-abụ ụmụ m, dịka Ruben na Simiọn si bụrụ ụmụ m. 6Ma ụmụ ọzọ a ga-amụtara gị ga-abụ nke gị. Ọ bụ aha ụmụnne ha ndị a ka a ga-eji mara ha nʼala nketa nke ha. 7Ana m eme nke a nʼihi na mgbe m si Padan Aram pụta, nne unu Rechel, nwụrụ nʼala Kenan mgbe anyị ka nọ nʼụzọ ije anyị nʼebe dịtụ anya site na Efrat. Nʼakụkụ ụzọ e si aga Efrat, ya bụ Betlehem, ka m likwara ya.” 8Mgbe Izrel hụrụ ụmụ ndị ikom abụọ Josef kpọ bịa, ọ jụrụ Josef ajụjụ sị, “Ndị a, bụ ndị ole?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.