Native Bible

Genesis 48:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼoge a, Izrel adịghị ahụzikwa ụzọ nke ọma nʼihi ime agadi ya. Ya mere, Josef duuru ụmụ ya ndị ikom ndị ahụ bịa nso ebe nna ya nọ. Mgbe ahụ, Jekọb suturu ha ọnụ, makụọ ha.

Genesis 48:10 in English

Genesis 48:10 · Berean Standard Bible

Now Israel’s eyesight was poor because of old age; he could hardly see. Joseph brought his sons to him, and his father kissed them and embraced them.

Context

8Mgbe Izrel hụrụ ụmụ ndị ikom abụọ Josef kpọ bịa, ọ jụrụ Josef ajụjụ sị, “Ndị a, bụ ndị ole?” 9Josef zara nna ya sị, “Ha bụ ụmụ ndị ikom ndị Chineke nyere m nʼebe a.” Ya mere, Jekọb gwara ya sị, “Kpọtara m ha, ka m gọzie ha.” 10Nʼoge a, Izrel adịghị ahụzikwa ụzọ nke ọma nʼihi ime agadi ya. Ya mere, Josef duuru ụmụ ya ndị ikom ndị ahụ bịa nso ebe nna ya nọ. Mgbe ahụ, Jekọb suturu ha ọnụ, makụọ ha. 11Izrel sịrị Josef, “O nweghị mgbe m lere anya na m ga-ahụ ihu gị ọzọ. Ma Chineke emeela ka m hụkwa ụmụ gị.” 12Josef sitere nʼikpere* Jekọb kupu ụmụ ya, bịa hulata isi ala. O kpuru ihu ya nʼala mgbe o mere nke a.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.