Jenesis 48:11
Genesis 48:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Izrel sịrị Josef, “O nweghị mgbe m lere anya na m ga-ahụ ihu gị ọzọ. Ma Chineke emeela ka m hụkwa ụmụ gị.”
Genesis 48:11 in English
Genesis 48:11 · Berean Standard Bible
“I never expected to see your face again,” Israel said to Joseph, “but now God has let me see your children as well.”
Context
9Josef zara nna ya sị, “Ha bụ ụmụ ndị ikom ndị Chineke nyere m nʼebe a.”
Ya mere, Jekọb gwara ya sị, “Kpọtara m ha, ka m gọzie ha.” 10Nʼoge a, Izrel adịghị ahụzikwa ụzọ nke ọma nʼihi ime agadi ya. Ya mere, Josef duuru ụmụ ya ndị ikom ndị ahụ bịa nso ebe nna ya nọ. Mgbe ahụ, Jekọb suturu ha ọnụ, makụọ ha. 11Izrel sịrị Josef, “O nweghị mgbe m lere anya na m ga-ahụ ihu gị ọzọ. Ma Chineke emeela ka m hụkwa ụmụ gị.” 12Josef sitere nʼikpere* Jekọb kupu ụmụ ya, bịa hulata isi ala. O kpuru ihu ya nʼala mgbe o mere nke a. 13Josef kpọọrọ ha abụọ, Ifrem nʼaka nri ya nke bụ aka ekpe Izrel, na Manase nʼaka ekpe ya nke bụ aka nri Izrel, kpọta ha bịa nna ya nso.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.