Jenesis 46:25
Genesis 46:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị a bụ ụmụ ndị ikom a mụụrụ Jekọb site na Bilha, odibo nwanyị ahụ Leban kpọnyere nwa ya nwanyị Rechel. Ha niile dị asaa.
Genesis 46:25 in English
Genesis 46:25 · Berean Standard Bible
These are the sons of Jacob born to Bilhah, whom Laban gave to his daughter Rachel—seven in all.
Context
23Nwa nwoke nke Dan mụrụ bụ,
Hushim. 24Ụmụ ndị ikom Naftalị bụ,
Jaziil, na Guni, na Jeza, na Shilem. 25Ndị a bụ ụmụ ndị ikom a mụụrụ Jekọb site na Bilha, odibo nwanyị ahụ Leban kpọnyere nwa ya nwanyị Rechel. Ha niile dị asaa. 26Ya mere, ndị niile so Jekọb gaa Ijipt, ndị bụ ụmụ ụmụ ya, na-agụghị ndị nwunye ụmụ Jekọb niile, dị iri mmadụ isii na isii. 27Tinyere ụmụ ndị ikom abụọ amụtara nye Josef nʼIjipt, ndị si nʼezinaụlọ Jekọb gara Ijipt dị iri asaa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.