Jenesis 46:20
Genesis 46:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼala Ijipt, a mụụrụ Josef Manase na Ifrem, site na nwunye ya Asenat nwa nwanyị Pọtifera, onye nchụaja nke On.
Genesis 46:20 in English
Genesis 46:20 · Berean Standard Bible
Manasseh and Ephraim were born to Joseph in the land of Egypt by Asenath daughter of Potiphera, priest of On.*
Context
18Ndị a bụ ụmụ a mụụrụ Jekọb site na Zilpa, odibo nwanyị ahụ Leban kpọnyere Lịa nwa ya nwanyị. Ha dị iri na isii nʼọnụọgụgụ. 19Ụmụ ndị ikom Jekọb site na Rechel nwunye ya bụ,
Josef na Benjamin. 20Nʼala Ijipt, a mụụrụ Josef Manase na Ifrem, site na nwunye ya Asenat nwa nwanyị Pọtifera, onye nchụaja nke On. 21Ụmụ ndị ikom Benjamin bụ,
Bela, Beka, Ashbel, Gera, Neeman, Ehi, Rosh, Mupim, Hupim na Aad. 22Ndị a bụ ndị ikom nke Rechel mụụrụ Jekọb. Ha dị iri na anọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.