Native Bible

Genesis 45:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, ha hapụrụ ala Ijipt mechaa rute ala Kenan, bịakwute Jekọb nna ha.

Genesis 45:25 in English

Genesis 45:25 · Berean Standard Bible

So the brothers went up out of Egypt and came to their father Jacob in the land of Canaan.

Context

23O zipụụrụ nna ya ihe ndị a: ịnyịnya ibu iri ndị e bokwasịrị ihe mara mma niile si nʼala Ijipt, na nne ịnyịnya ibu iri ndị e bokwasịrị ọka na achịcha, na ihe ndị ọzọ dị iche iche, nʼihi ije ya. 24O zipụrụ ụmụnne ya. Ma oge ha na-achọ ịhapụ ya, ọ gwara ha sị, “Unu esekwala okwu nʼụzọ.” 25Mgbe ahụ, ha hapụrụ ala Ijipt mechaa rute ala Kenan, bịakwute Jekọb nna ha. 26Ha gwara ya sị, “Josef ka nọ ndụ. Nʼezie, ọ bụ ya na-achị ala Ijipt niile.” Ma o siiri Jekọb ike ịnabata akụkọ a. O kwenyeghị na ọ bụ eziokwu. 27Ma mgbe ha gwasịrị ya ihe niile Josef gwara ha, mgbe ọ hụkwara ụgbọala niile Josef zitere ka e jiri bute ya, mmụọ nna ha Jekọb lọghachiri.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.